Call Us: +234913 605 7163

Igbo Language

Ntootu Mak ỌrụmụAsusu

Taam nke Atọ n;afọ 2019/2020

Izuuka nke mbu.

  1. Mmeghari ihe e lere n’ule taam gara aga
  2. Idetu usoro ihe ọmụmụ

    Ch.  Ule mmalete taam

NTOOTU MAKA IZUUKA NKE ABUỌ (2ND WEEK) NA NKE ATỌ (3RD WEEK)

ISIOKWU: OLUNDI NA IGBO IZUGBE

Olundi maobu Olumba bụ otu mba di iche iche n’ala Igbo si edobe olu were azuputa Igbo nke ha. Ala Igbo buru ibu nke ukwuu ma dikwa ọtụtụ ka olu ha na-eziputa mgbe ha na-asụ asụsụ Igbo sikwa di otụtụ. Ndi amaara bụ ndị Igbo bụ ndi bigasi na steeti Imo, Anambara, Abia, Ebonyi na Enugwu nakwa ufodu mpaghora Delta. N’ime steeti ndi e nwere olu di iche iche e jirir mara ndi dika:

  1. Olu Owerre
  2. Olu Ọnicha
  3. Olu Nnewi
  4. Olu Nsuka
  5. Olu Nkanu
  6. Olu  Abakeleke
  7. Olu Awka
  8. Olu Aguata
  9. Dgz.

Obodo niile ndi a sụọ asusu Igbo ebe ọbula Iga achoputa mpaghara ala Igbo ha siri pụta.

Omụmaatụ Olundi na mba na-asu ya

 

Obodo

Olundi

1. 

Nnewi

Ukaa

2. 

Owerre

Ọ dị ọtị

3.

Onicha

Fa lara mmiri

4.

Orumba

Fụọ

5.

Nsuka

Asụ

6. 

Abakeleke

Munyi

 

 

Njirimara Olundi

  1. Ndi Igbo niile anaghi aghota ya
  2. Ọ naghi agbaso udaume iwu ndakorita uaume mgbe a na-aọu ya
  3. A na-enwe ndiiche n’olundi n’ibe ya
  4. Anaghi eji ya ekwu okwu n’oha
  5. Eji ya akuziri ụmụaka asusu n’ezinaulo tupu obido akwụkwọ
  6. A na-enwe ihe mgbanwe n’ime ya siterena otu obodo gaa n’otu obodo.

Uru Olundi bara

  1. Ọ bụ sitera njikọtaru nke Olundi di iche iche ka esi nweta Igbo Izugbe ufodu.
  2. Ọ na-eme ka mara mkpaghara mmadu siri puta.
  3. Ọ na-akwalite omenaala ndi

Ogho m di n’Olundi

  1. Ọ na-eweta nkewa na ebe ndi Igbo anaghi asụ otu Olundi di.
  2. A na-enwe nsogbu nke aghọtaghi ihe onye mba ọzọ na-asu.
  3. Madu abụọ bụ otu Obodo nwere ike iji Olundi ha refuo onye abughi onye be ha.

Omumaatu Olundi na Mba na-asu ya

Olundi

Mba na-asụ ya

1.        

Ụkaa

Nnewi

2.        

Ọ di ọti

Owerre

3.        

Fa

Onicha

4.        

Onyaoke

Nsuka

5.        

Ashu

Enugwu/Nsuka

6.        

Utukpe

Mmaku

7.        

Fụọ

Orumba

8.        

Ive

Nando

 

Igbo Izugbe

Igbo Izugbe bụ asụsụ Igbo e kwekọritara ka ọ buru asụsụ jikọtara Igbo niile onu n’agbanyeghi ebe onye siri puta. N’odide Igbo ọ bụ naani Igbo Izugbe ka ejị akuzi ihe n’ụlọakwụkwọ primari, sekọndiri na mahadum. Igbo Izugbe mere ka ọ diiri onye ọbụla mfe ịghọta Igbo onye  ọbula si mba di iche iche na-asu. Ọ dighi otu mba ga-asi na ọ bu ha nwe Igbo Izugbe. Ọ bụ sitena njikotanu nke Olundi di iche iche otu S.P.I.C mere ka eji weputa Igbo Izugbe.

Njirirmara Igbo Izugbe

  1. Ọ bụ asụsụ Igbo nwafo Igbo ọbụla na-anụ, na-asụ ma na-aghọtakwa.
  2. Ọ bụ asụsụ zụrụ Igbo niile ọnụ
  3. Ọ bụ asụsụ Igbo eji ede ma na ebiputakwa akwukwo agumagu di iche iche.
  4. O bụ ya ka onye nkuzi ji akuzi ihe na Klaasi.
  5. Anaghi enwe ihe mganwe n’ime ya siterna otu obodo ruo n’Obodo ozo.

Uru Igbo Izugbe bara

  1. Isu Igbo Izugbe mere ka ikpa oke maobu nkewa hapu idi n’etiti mmadu na ibe ya.
  2. Igbo Izugbe mere enwee otu aha a na-akpọ ihe ufọdụ n’asụsụ Igbo.

Ntulekọrita Olundi obodo na obodo Olundi Owerre na Onicha

 

Owerre

Orucha

Igbo izugbe

Bekee

1.        

ahu

Arụ

ahu

Body

2.        

aha

afa

aha

Name

3.        

Iṅu mmiri

ịla mmili

ịnụ mmiri

To drink

4.        

Bia ebe a

Feta ebe a

Gafete ebe a

Come here

 

 

Nsuka

Abakaliki

Igbo izugbe

Bekee

1.        

fuanwabe

lofuleka

Fụọ ebe a

Go away

2.        

Nwagbọgọ

Nwamgbọgọ

Nwagbogho

Girl

3.        

Ehọọ

Efọ

Afo

Stomach

4.        

Hube

Ekahu

Ebe ahu

There

5.        

Munyi

Munyi

Mmiri

Water

6.        

Asụ

ụka

Asi

Lies

7.        

Ụgọdụ

Nkụta

Nkita

Dog

8.        

Okerekwu

Okerefu

Oke

Rat

9.        

Ekwụkwọ

Ekwọ

Akwukwo

Book

10.    

Onyo

Inyo

Ugogbe

Mirror

Okwu Igbo Izugbe ụfọdụ na Olundi ya

 

Olundi

Igbo Izugbe

1.        

Ndịị/Ndee

Ọlee

2.        

Eshi/mbosi/ubọshi ehi

Ụbochi

3.        

Alọ/iijee/ala/ịlọ

Nnọọ

4.        

Akana/ụbụbo

Akụkọ

5.        

Nọọnwa/ikaa/nga kanu/kana

Ebèá

6.        

Gụnụ/giri/ngini

Gịnị

7.        

Afụfụ/efufu/awuhụwu

Ahụhụ

8.        

Ife/iye/nhe

Ihe

9.        

Ịbọ/eboọ/abụa/ebo

Abụọ

10.    

Arọ/aho/awhọ

Afọ

11.    

Ogụ/orụ/ohu

Iri abụọ

12.    

Ụrọ/unyo/uno

Ulọ

13.    

O vuru ivu

ọ buru ibu

14.    

Ndaa/nni/ndii/ndighi

Kedu

Omenaala akaoru

Gini bu akaoru/ọrụaka

Akaorụ bụ ihe mmadu na-eme na ndu ejiri mara ya nke ha na esite na ya enweta nri mbochi ha. Ndi Igbo kwenyere n’aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ, ọzọkwa na ngana kpuchie ute, agụụ ekpughee ya. Ọ bụ ya ka ha ji agba mbo inwe ihe onye na-eme e ji mara ya.

                Ndi Igbo dika ndi eji Igba mbo mara nwere ọtụtụ oruaka di iche iche ha na-aru nke gụnyere:

  1. Oru Ugbo
  2. Iku azu
  3. Izu ahia
  4. Ikpa Umu anụmanụ
  5. Ite mmanya
  6. Ikpa nkata
  7. Ikpu ụzụ
  8. Igbu ichi
  9. Ime dibia
  10. Itu ihe otụtụ
  11. Igba afa
  12. Ichu nta

 

 

  1. Oru Ugbo:- E ji Oru Ugbo mara ndi Igbo. Ha na-akọputa ji, akpu, ede, ọka, osikapa, egwusi, akwukwo nri dgz.
  2. Iku azu:- Akaọrụ ọzọ ejiri mara ndị Igbo bụ ndi bi n’akụkụ mmiri. Ha na-eji Ukpoo, ogbu, Idide, eriri, osisi nkata aku azụ.
  3. Ikpa Umu anụmanụ:- Ikpa Umu anụmanụ bụkowa akaoru eji mara ndi Igbo. Ha na-akpa ehi Igbo, ewu, ezi, okụkọ, atụrụ, nkita
  4. Ite mmanya:- Ite mmanya sokwa nioruaka ndi Igbo. Osisi a na-esi na ya enweta mmanya bụ ngwọ na nkwu. Ọ bụ ya ka eji akpọ mmanya e nwatara na ha mmanya ngwọ ma ọ bụ mmanya nkwu elụ. Ebe esi enweta ezigbo mmanya nkwu elu n’ala Igbo bụ ndi Enugwu Ezike, ebe esi enweta ngwọ bụ Oba na Ugwuoba. Mmanya ndi a na-enye ndị ọrụaka ego n’uju.
  5. Ichu nta:- Ichu nta bukwa akaorụ eji mara ndi igbo ndị ji ya mere akaọrụ na-anọ n’ime ohia oge niile na-ede anu ha ga-egbu. Ihe eji achu nta bụ mma, ụta, egbe dgz.
  6. Azumahịa:- Akaọrụ ejirir mara ndi Igbo bụ izu ahia. Ọ bụ azumahia ka eji mara obodo dike Onicha na Nnewi dgz.
  7. Ime dibia:- Ime dibia sokwa n’akaoru eji mara ndi Igbo. Ndi dibia na-agba afa, na-achu aja, na-enyekwa ndi ọrịa ọgwụ.

 

 

 

 

Oruaka

Obodo na-aru ya

1.        

Ọrụ Ugbo

Anam, Ogaru, Abakeleke, Afoikpo, Ohaozara, Aguleri

2.        

Iku azu

Aguleri, Anam, Asaba, Ogbaru

3.        

Ikpa umu anumanu

Abakeleke na Ohaozara

4.        

Azumahia

Onicha, Nnewi, Oka, Abia, Owerre na Arochukwu

5.        

Ite Nkwu

Eziagu, Udi, Oba na Ugwuoba

6.        

Ichunta

Achala

7.        

Igbu Ichi

Ụmụnaachu

8.        

Ikpu uzu

Ọka

Uru Ọruaka bara

  1. Ọrụaka na-enye ego
  2. Ọ na-ebelata ime mpu n’obodo
  3. Ọ na-akwalite Omenaala
  4. Ọ na-eme ka mmadu nwee ugwu
  5. Ọ na-akwalite mmekọrịta mmadu n’ibe ya

 

 

 

 

Izuuka nke Ano (4th week)

Ogụgụ na aghọtazaa

  1. Ndi ntorobia bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyi di n’ogbata afọ iri na abụọ wee ruo na agbata afọ iri abụọ na otu. Ha bụ ndi nọ n’agbata umuaka na agbata ndi okenye. Ha abụghị ụrụaka nke ha ji abụ Okenye. Ha bụ ndi malitere ibi ndu ohuu, bu ndi ejighi. Ihe kporo ihe. Otụtụ n’ime ha ka ndu ha na-ejuputa niakparama agwa ojoọ dị iche iche nke ha na-amuta n’aka onwe ha. Otụtụ n’ime ha naghi enwe echichie maka echi, naani ihe ha maara bụ ihe chi fotere ya burụ ọgbasaghi
  2. Ahuike bụ mgbe mmadu nọ na-enweghi ihe na-aria ya dika ọrịa. Ahuike ndi ntorobia bụ mgbe ndi ntorobia nọ na-ọnweghi ọrịa ha na-aru. Ndi mmadu na-enwekari ahiuke mgbe onye ahu maobu ndi ahụ na-eri ihe ahu ha chọrọ na-edobekwa gburugburu ha ọcha mgbe niile.

 

Ufọdu ọrịa maobu nsogbu nwere ike ichere ndị ntorobia aka mgba

  1. Orịa mminwu
  2. Afọ ọsisa
  3. Gonoria
  4. Ukwaranta
  5. Sifilis
  6. Iba Ojii
  7. Ukwara
  8. Akwukwo
  9. Obirinajaocha
  10. Ọchananya
  11. Ịba ojii

Ihe ndị nwere ike ibute enweghi ahụịke nke ndi ntorobia

  1. Anaghị erị nri ahụ chọrọ
  2. Anughi ezigbo mmiri
  3. Edobeghi gburugburu ocha
  4. Anaghi ekpochasi ọwa mmiri
  5. Inubiga mmanya oke
  6. Ikuru anwuru oku sitere n’afọ ihe a kporo. ọkụ na gburugburu ha.
  7. Anaghi asa ahu nke ọma nakwa isu akwa
  8. Inwe mmeko nwoke na nwanyi
  9. Inu ọgwụ aghara aghara

Uzọ mgbochi Orịa

  1. Ndi ntorobia ikpachipụ anya na udi nri ha na-eri
  2. Izuchasi okirikiri ebe ha bi
  3. Izere mmekọ ọbụla, ma nke nwoke na nwanyi nakwa nwanyi na nwanyi
  4. Ikwusi inu mmanya na-aba n’anya
  5. Isa ahụ oge onula
  6. Ikwusi inu ogwu dọkinta e nyeghi

 

 

 

Izuuka nke ise (5th week)

  1. Usoro odide akara edemede
  2. Atumaatuokwu, nkowa n’udi ya di iche iche.

Gini bụ akaraedemede

Akaraedemede bụ ụmụ irighiri akara a na-etinye mgbe a na-ede edemede maọbu a na-etnye n’ihe ederede iji mee ka ihe ahu nwee nghọta zuru oke madikwa ụtọ ogụgụ.

Nkenudi akara edemede

  1. Akara kpom (.) fullstop
  2. Kpom kpom (:) Colon
  3. Kpom rikom (;) Semi colon
  4. Rikom (,) Comma
  5. Rikom elu (’) apostrarophe
  6. Akarangwu (“ ”) quotation mark
  7. Akaraajuju (?) question
  8. Akara mkpu (!) exclamation mark
  9. Akara mkpuchi (( )) bracket
  10. Akara ulue (-) Hyphen
  11. Akara udaolu (/ - ) tone mark
  12. Akara nkwubiri (--------) ellipses
  13. Akara mmagha (^) Omission

Akara kpom

  1. Kpom bụ otu n’ime akara edemede nke na-egosi nkwusi n’ahiriokwu obula. Ọ bụrụ na kpọm adighi n’ahiriokwu ahụ ga-agbagwoju anya. Ọ gaghi ekwe ogụgụ ima-atua:
    1. Ada di ọcha
    2. Okeke na Obi bụ enyi
  2. Rikom: Rikom bụ akara edemede nke eji egosi na ahiriokwu agwuchabeghi, na onye na-ekwu chọrọ ikute ume tupu okwuru gabakwa. Ima-atu:
    1. A chọrọ nwoke, nwanyi, ụmụaka na ndi ntorobia n’ogbakọ ahụ
    2. Ji, Osikapa, ede na agwa bụcha ihe oriri.
  3. Akara ajụjụ:- Ọ bụ akara edemede a na-etinye na mkpuruokwu maobu ahiriokwju ndi ahu na-eziputa ajuju. O nwere mkpuruokwu amaala dika njuajụjụ, lee ha:-
    1. Gini?
    2. Kedu?
    3. Ebee?
    4. Onye?
    5. Olee?

 

  1. Gini ka ị na-achọ?
  2. Ebee ka ị na-aga?
  3. Olee ndi bu ndị a?
  4. Ị nyụrụ nsi n’ubi m?
  5. I kuuru ofe n’ite m?

4. Akara Uhie: Ana etinye akara uhie naetiti mpkụrụ asụsụ abụọ nwere ike irụkọ ọrụ ọnụ mana ha abụọ enweghi ike ịnọkọ ọnụ. Ana-ahu nke na nnyemakangwa na mmekangwaa. Ọmụmaatu:

    1. Ada na-esi nri
    2. Ngozi na-ebe akwa

Ch. Anyi ga-echu mmiri

d.  Ọ ga-anya ọkụ

 

b.  Atumaatuokwu (figures of speech):- Gini bụ atumaatuokwu. Atumaatuokwu bụ okwu nka dị iche iche eji achọ okwu na ederede mma. Atumaatuokwuna-eme ka okwu tọọ uto na nti mgbe a na-anu ya ha nwekwara nghọta zuru oke maka. Ihe odee maobu okwuu chọrọ izuputa.

 

Atumaatuokwu dị iche

  1. Mburu (metaphor)
  2. Myiri (simile)
  3. Mmemmadu (Personification)
  4. Nzinuda (Onomatopia)
  5. Nkwusara (Hpostrophe)
  6. Ekwuechezo (Irony)
  7. Egbeokwu (Hyperbole)
  8. Ajụjụ nzaraonwe (Rhetorial question)
  9. Ilu (Trollers)
  10. Ukabuilu (Parables)
  11. Akpaalaokwu (Idioma)
  12. Urọokwu (Pun)
  13. Soromchia (Jokes)
  14. Nkwuma (Euphemism)
  15. Ọrurụghaokwu (Climax)
  16. Abuabughi (Posetive negativism)
  17. Akpuokwu (Epigram)
  18. Agwugwa (Riddles)
  19. Mghagideokwu (Oxymoron)
  20. Okwuntughi

Nkowa Atumaatuokwu ole n’ole 

Mburu:-  Nke a bụ atumaatuokwu na-egosi na ihe a-na-ekwu maka ya buzi ihe ọzọ iji gosi ka akpara magwa n’udidi ha siri bụrụ otu.

Omụmaatu:-

  1. Nna m bụ agụ
  2. Oroma a bu shuga

Ch. Chibuzo bụ edi

d. Amaka bụ Clundi

 

Myiri:-  Nke a bụ atumaatuokwu eji egosi na ihe dika ihe ọzọ maobu na ihe a kpọrọ aha na-eme ka ihe ọzọ.

Omụmaatụ:-

  1. Ọ piri ọnụ ka ntu
  2. Chinedu dika mmonwu

Ch Chidiogo dịka nne ya

d. Ekene dika anyanwu ụtụtụ

 

Mmemmadu

Ọ bụ atumaatuokwu na-agwa ihe abughi mmadu okwu ka a ga-asi na ihe ahụ bụ mmadu. Ana egosiputa ihe enweghi ndu ka o nwere ndu.

Omụmaatụ:-

  1. Mmanya ahu mara m aka nti
  2. Aguu piara ha utali
  3. Onwu kụorọ ezinaụlọ ahụ aka n’ụzọ n’uzu ututu taa.

 

 

 

Izuuka nke isii (6th week)

Ekwumekwu: Nkọwa banyere ezinaulo onwe

Gini bụ ezinaụlọ onwe?

Ezinaụlọ bụ ebe mmadu na ndi metụtara ya bi n’otu ebe. Ezinaụlọ bụ ewumewu nwere nnukwu ọnọdụ na ndu ndi Igbo. Ọ bụ ebe di nwunye na ụmụaka ha bi n’otu ngwuru. Ọ  bụ na ezinaụlọ ka mmekorita mmadu n’ibe ya na-amlite. Nwata obula nọ n’ezinaụlọ kwesiri ọ mara aha obodo ya nakwa ogbe ya. Marakwa aha nne na nna ya nakwa aha otutu ha. N;oge gboo umuaka na-akpo nne ha ‘nne’ na-akpokwa nna ha nna anyi maobu aha otutu ya. Nwaanyi na-akpo di ya nna anyi, maobu di m oma, di na-akpo nwunye ya oriaku m ma obu aha otutu o nyere ya.

Ọrụ diiri ọnye na ezinaụlọ

Ọrụ Nne na Nna:

  1. Inye ụmụaka ọzụzụ kwesiri ekwesi sitena na mgbe a mkputara ha.
  2. Ikpata nri ezinaụlọ ga-eri

Ch. Izu ụmụaka n’ụlọakwukwo maobu n’ọrụaka ọzọ nke ga enyere ha aka ikwwudonwu n’onwe ha na ndu.

 

 

Go to top